NCHETA IGBO 2013
OZI
EKELE NNO (WELCOME ADDRESS) BIARA UNU SITE NA-AKA MAZI NNAMDI OBODOECHI, ONYE
NLEKOTA UMU BIAFRA NA GREECE.
Ndị Biafra ekelem ụnụ!
Anyị bụ otu akpọrọ “Biafrans in Greece under RadioBiafra” bidoro
ka Ọnwa
Sepụtemba dị nkpụrụ ubọchị iri na-afọ iri abụọ n’iri na-atọ, ya bụ 2013 na asụsụ bekee.
Anyị onwe anyị matara na ngwere adịghị agba ọsọ etịtị ehihie n’efu, ya mere ihe kpọkọbara anyị dum taa bụ: Nke Mbu “Ncheta Umu Biafra’ bụ ndị egburu n’ ọgụ nke Nigeria na Biafra, akpọrọ ọgụ genocide ndi Nigeria jịrị megide ụmụ Biafra.
Ọgụọ bidoro na-afọ 1967, we ruo na-afọ 1970, ya bụ afọ atọ zụrụ ezụ ka ndị Nigeria, na nkwagide Ndị Britain, Russia na Eygpt kwafuru ọbara ụmụ Biafra na-ala Biafra: Umụ nwanyị di’ime ọnwụ, ụmụ ntakịrị ọnwụ, ndị Ne’ejighị arụ (ahụ) ọnwụ, ihe nile Biafra nwere mmebi mmebi!
Ndi
Biafra ka nọ n’ ọnodụ agha ahụ debere ha wee rụọ taa. Nkea mere Ndi Radio Biafra, ndị Belie Human Right Initiatives, nakwa ndị okenye nlekọta na-ala Biafra bụ ndị akpọrọ “Biafra Council of Elders” jị wee kwado nke ọma n’ ihe ga-ebị nsogbua nile bụ Biafra inọrọ onwe ya, ma hapụ tekọta Obodo Nigeria arụ.
Umụ Biafra nile, ndị n’ ụlọ, ndị bi n’ ezị (home and abroad) wee nọọ kwụsie ike sị n’ ọbụ nwere onwe ga-ebi okwua. Nkea bụ ihe mbu anyị jị gbakọ n’ụbochị tata, maka izọpụta Biafra na-aka Nigeria.
Nkea
abụọ mabụrụkwa ihe so nke mbu: Ncheta ụmụ Biafra. Ncheta ga-abụ nnukwu ncheta na-ala Biafra n’ odị n’ iru- ya bụ ihe ọkpụtọrọ ọkpụ.
Oga-adị nnọ ezị nma ka anyị kpọ aha ọtụtụ ụmụ Biafra, onye mbu bụ onye ọchị agha Col. Onwụatụegwụ onye Nnewi, onye jụrụ sị kama ya ilaghachị azụ na Nigeria, ka ya nwụọ. Owe nwụọ i’ihụ agha na Enugu, ebe ọchị ndị agha ya igbọchị ndi agha Nigeria. Onye abụọ bụ Col. Olihi, onye nke atọ, General Thomas Aguiyi Ironsi onye chọrọ ịdị n’ọtụ nke Nigeria, ha wee gbuo ya na 1966, onye nke anọ bụ: Major Victor Banjọ. Anyi n’ echetakwa mmadụ dika Major Nzeogwụ onye si Okpanam wepụta.
Tata
bụ oke ụbọchị Ncheta ha dum na-ala Biafra, nakwa ala Greece
dika ụmụ Biafra n’ ụwa nile n’ eme Ncheta nye nkpụrụ obi ha. Ka mkpụrụ obi ha dum zuru ike na ndokwa Iseeee!
UKWE ONYE OBULA GA-EKWE:-
1. Ewoo
mụ na nwannem jere agha apịrị ego Ifejuna rere anyị... Gụọ ụnụ azaghachim.
2. Nigeria
oo hapụ ndị ka ha laa, anụrụm onụ si n’ elu igwe hapụ ndịm ka ha laa.
3. Anyị agaghị ekwe ma anyị enwetaghị Biafra, anyị agaghị ekwe.
4. We
are soldiers fighting for our nation in the name of Yahshus we shall conquer
aaa.
5. Imela
Ojukwu imela, agam esoro ụmụ aka ibem gaa war front were ezigbo madicine gbaa
ndị Hausa, Ojukwu Imela, Ojukwu Imela!
Anyị agaghị echefu ịkpọ arụ aha ya ka arụ webelata-Col. Emmanuel Ifeajuna rere Biafra,
n’ ọtụtụ ndị ọzọ enyere ego ka ha ga ala bekee zụtara anyị ngwa agha, ha eburu ego ahụ gbalaga ruo tata. Aha nwoke mere nkea bụ Mmojekwu onye Nnewi.
Anyị agaghị ahapụ isi aka wee gbaba ụriọm, ya mere, ụmụ Biafra na ngalaba Greece (BIAFRANS IN GREECE
UNDER RADIO BIAFRA) n’ ekele ndị nlekọta Radio Biafra, Ndị Belie Human Right Initiatives dika akpọrọ ha na bekee nakwa ndị Biafra wepụtara ka ha bụrụ ọnụ n’ ekwụrụ ha na Nigeria tata bụ ndị akpọrọ “Biafran Council of Elders.’’ Ha n’ eme nkea
n’ ụzọ eziokwu.
Orụ ndịa nile na-arụ na-ala Biafra taa di ukwu ma rie nne, ịjị mee ka Biafra hapụ Obodo ọjọọ Nigeria n’ udo wee laa ala Biafra bụ ala Yahweh ChukwuAbiama kwere anyị na nkwa. Ka Chineke gbaa ha dum ume, ma bụrụkwa onye ndu ha. Iseee!
Mụ Onwem bụ Mazi Nnamdi Obodoechi, Ojukwu IgboNile, onye
Ihiala na Biafra land, Onụnaekwụrụ Ọra bụ onye nlekọta n’ onye ode akwụkwọ bụ mazi ThankGod Ochor na ndị isi otuo nile jịkọrọ aka wee narịọ ụmụ Biafra na mpaghara ọbụla nke Greece ka ha biko do doo dooo jịkọta aka ọnụ, ma kwagide Biafra n’ ihi n’ otu osisi adịghị emebe ọhịa, na gịdịgịdị bụ ugwụ eze! Achọrọm ka ụnụ mata n’ ọbụ ego jị ọrụ n’ịhị na-agbaghị aka ahụ nwata ezē.
Nzọpụta Biafra di oke mkpa, ma bụrụkwa ugwọ anyị nile jị Yahweh. Oga-adị nọọ ezi nma ka anyị lere ụmụ Biafra na Malaysia anya dịka agbambo na mmasi ha dum nwere n’ ọgụ inweta Biafra. Onye isi nke onye nlekọta ndị nlekọka ụmụ Biafra na mba ụwa dum bu mazi Ikechukwu Enyiagụ. Anam asị ka ụzụ na-amaghị akpụ ọgele (ọgene) ka ole egbe_ anya n’ ọdụ. Ya mere ka anyị ghọmia ha, bikonụ ụmụ nnem na ụmụnnam!
Kedu
agbam mbo gị maka
nkea? Kedụ ụkwụ ije gị maka nkea? Kedụ atụmatụ gị maka nkea? Kedụ nchepụta gị maka nkea? Gbakọọ, ma jụọ onwe gị ajụjụ? Egekwana ndị otu Saballat nti dịka ha ga n’ekwu na-ajụ, “Gịnị ka ndia e’ekwe? Ha ọsị na ha na-achọ Biafra? Onweghị evbe ha jị azụ aga. Nwannem, chịa ha ọchị, ma gaba n’irụ ọmesia ọnụ kwuru njọ ga-ekwu nma, ma jụba ase gị. Egwụ atụla gị n’ihi n’ etụa ka ha gwara ụmụ nne anyị ndị Israel mgbe ha n’ ewụ mgbidi Jerusalem na Nehemiah isi nke anọ, ama ụkwụ nke mbu wee ruo ama ụkwụ nke isii (Nehemiah 4:1-6). Onye nwe anyị sim gwa gị, atụla egwụ, gị kam nọnyere,...............Isaiah 41:10-13.
Arọrọm ụmụ Biafra, zisanụ oziọma Biafra nye onye ọbụla bụ onye Biafra, gwa ha na Biafra bụ ike anyị, Biafra bụ ugwụ anyị, Biafra bụ ndụ anyị, Biafra bụ ọṅụ anyị, Biafra bụ oke Obodo anyị ga –agbaba n’ ime ya wee nwee mmerị. Ma Nigeria bụ ebe ịta ahụhụ, ebe ọnwụ, ụlọ mkpọrọ, ụlọ ebe ana-akpa ụmụ anụmanụ, be ndị Boko Haram, ka anyị gba mbo pụta na ya, ma nwee ndụ.
NKEA
BU OKE UGWO IJI OBODO GI BU BIAFRA
Anyi
chọrọ Biafra! Anyị chọrọ inwe iwu ana-ahụghị mmadu ọbụla wee mee. Anyị chọrọ iga njem n’ụkwụ anyị n’ ihi na Biafra akarigo ịkwọ na-azụ, ụkwụ ya ana-emetụ ala dika Nigeria kwọ Biafra kemgbe na mmegbu.
Umụ Biafra na Greece ndụ ụnụ! Ndị nile na ala Biafra ndụ ụnụ! Nnamdi kanu ndụ gị, Ndị nile nke Biafra na mba ụwa ndụ ụnụ! Biafra ndụ gị ooooo!
Ka ọmesianụ!
No comments:
Post a Comment