Biafran Colt of arm

Biafran Colt of arm
Biafra is my Right

Friday, 3 July 2015

Akuko Uwa Na Ihiala AnniVersary 2007





AK UKO  UWA NA IHIALA

ANNIVERSARY 2007:- BY Mazi Nnamdi Obodoechi.

 Ndị igbo ndị ọma n’ ege ntị, ụnụ anwụchụna!

 Akụkọ ụwa ụnụ nanụ si na Radio Ihiala local government Area Anambra, ngalaba Athens Greece webiara ụnụ na-abalia.

Onye nagụputa ya bụ mazi Nnamdi Obodoechi (Onụnaekwuruọra), (Ojukwu) nke Greece.

         Ugbua nurunu akuko anyi n’ uju!

 Ndị otu Ihiala local government Area association nke ngalaba Athens Greece-ILGA naha ichafụ akpọla ọhaneze oku dị oke mkpa maka nnukwu emume ncheta afọ iri kpọmkwem ọgbakọa ji malite n’ obodo ochiea bụ Greece.



                                  (2)
Na mbido otua, ha Gbara mbo ịhụ na ndị Ihiala nile bi n’ ezi obi n’ enweghị ihe isọngọngọ ọbụla, ọkachasi na nbikọ nke ụmụ nne na ụmuụ nne nke pụtara n’ otua hụrụ mmadu ibe ha nanya, ma burukwa ndi eji amatụ n’ ime ọgbakọ ndi ọzọ.
                                 
                                                                   
                                    (3)
Ogbakọ a mere ka ọhaneze mata n’ ọnụ ụzọ ama ha ghe oghe na-akụkụ ọbụla iji nabata onye ọbụla chọrọ ibu onye otua n’ihi na gidigidi bụ ugwu eze, maka ojeremarịtị n’ asụsụ bekee.               
                               

                                     
                                    (4)
 Okpuru ọchịchị Ihiala ngalaba Athens Greece bidoro n’ afọ puku na narị itolu n’ iri itolu n’ isii, ya bụ (1996).
Ndị kpọbara otua bu MAZI CHUKS ILODUBA, MAZI VALENTINE OKOLIE nakwa MAZI SUNDAY ONWUCHEKWA bụ ide ji ụlọ, onye anọrọ na be ya bido ọgbakọ a n’ ọtụtụ ndị ọzọ Gbara mbo Ihiala ewe wuru dika osisi ọjị n’ ụbọchị taa n’ ihi n’ otu osisi adịghị emebe ọhia.
            

                                    (5)
Mgbe ndị ụlọ ọrụ Radio Ihiala nagba Mazi SUNNY ONWUCHEKWA ajụjụ ọnụ n’ isi ụlọ ọrụ anyi di na SIKIROU na Athens, ka ọgwara ọhaneze n’ ọchịchị ime obodo Ihiala bụ obodo ejiri ọrụ ugbo dịka ịrụ jị, akpụ, Ede, Ọka, Unere, Okwuru (Okro), Ikpa Ewu, Okụkọ, Ezi, Aturu, Ehi, Isu akwụ mmanụ, Ogbọnọ, Mangoro, Oroma, Ube, Agbi ilu, Aki bekee na Udara wee mara n’ ala Igbo nakwa n’ ala Nigeria.

Ogakwara n’ ihu ma kwupute etu okpuru ọchịchị Ihiala si agba mbo n’ ihe ọbụla ejị –ebi ezi ndụ dịka Agụm akwụkwọ, Ọrụ bekee dika Ọrụ nkuzị, Dibia bekee, Ọrụ nka n’ ụzụ nke ndi bekee nakpọ (Technology), Azụm ahia, Ọrụ mgbasa ozi, nakwa ọrụ ngo ndị ọzọ gasi.



Osi na ya bụ Obodo bụ oke mba ụwa nasọpụrụ, Ha bukwa ndi nasọpụrụ ome na-ala nke ukwu. Ha abụghị ndi ejiri ohi n’ aghụghọ we mara. Odụrụ onye ukwu n’ onye nta ọdụ ka onye ọbụla nwe ezi ihụnanya, ezi uche, nabụghị ndị ntaji anya ma –ọlị, ma jisie ike n’ ịzụlịte ụmụ  aka anyị n’ akwụkwọ na akwụkwọ bụ ike n’ ọganiru, ma dịkwa oke mkpa na ndụ onye ọbụla n’ ihi n’ iga n’ iru bụ ndụ ma ịlaghachị azụ bụ ọnwụ.                                       

                                                              
                                   (6)
               NKEA BU MAKA ONWU MMADU:-
Onwụ egbuola mazi osi Kampa na lọlọ ya bụ ekpomekpo nke bụ stuu ma asụgharịa ya na bekee. Di na nwunye a zutere ọnwụ ha site n’ ihe mberede nke okporo ụzọ mgbe ha si obodo ha alọta Athens Greece ka ọnwa Ekeresimesi di n’ ụbọchị nke mbu (1st).


 Otua ka mmemme akwam ozu ha ga esi ga:-
Ozu ha ga-arapụ ebe anachekwa ozu n’ ụbọchị iri abuo n’ ise n’ ọnwa Ekeresimesi na- afọ puku abụọ na-asaa (2007), we rute na be ha bụ Afọ (Stomarch), ebe ụmụ okpo (worms) ganọ we mụọrọ ha anya abali tupu elie ozu ha n’ ebe ana eje mposi (toilet).


Ndị di nanyunyea rapụrụ bụ ndị neruru ha ụjụ ọnwụ ha bụ Mazi mmanu di ọpkara ha, Nnu- ada ha nwanyị, Magi, Caryfish, Curry, Iyabasi n’ ikwu na ibe ya ndị sokwa eru ụjụ ọnwụ ha.
 Onye tnyere aka n’ ọkwaa bụ nwa nne nna ya bụ Ngazi naha ezi n’ ụlọ.                                            
                                                   
                                   (7)
           OZI ANYI SIRI MBA UFESI NWETA:-

Ogbakọ ndị Eze ọdịnala okpuru ọchịchị Ihiala agbasala ozi ekele pụrụ iche nye ndị Igbo nile bi ufesi (Ala bekee), si ha jisie ike, ma bụrụkwa r ndị nasọpụrụ Eze na ndị ndụ ha n’ usoro n’ ụzọ ọbụla ka ewere nwe ezi udo na- agam n’ irụ.
Ha gakwara n’ irụ site n’ onye ndu ha, n’ igwa ụmụ Ihiala nile nọọ Ufesi ka ha bụrụ ndị ndu nwa nne ha, mekwa ka akụ n’ uba ha ruo ụlọ n’ ihi n’ akụ rrụọ ụlọ  okwuo onye kpara ya.

Ogakwara n’ ihu ikwu ka anyị bụrụ ndị kwesiri ntụkwasi obi ma bụrụkwa ndi n’ ebi n’ udo n’ etiti ndị mba ọzọ.                                             

                                            (8)
Ndi Red Cross Society nke Nigeria ngalaba Ihiala local Government Area, Lucy Orphanage centre, nakwa Okija Leprosy Centre egosipụtala mmasi ha nwere n’ ebe ndị Ihiala local government ngalaba Athens Greece nọọ   n’ ihi oke enyem aka ha nyere ndị enweghị nne na nna, ndị ụwa natụ n’ ọnụ, nakwa ndị ọrịa epkenta na- afọ 2007.

Ha jikọtakwara aka ma si ka Chineke nọnyere, ma gozikwa ụnụ dum na ha ChukwuAbiama onye nwe anyị-iha! ihaa!! Ihaaa!!!                                  
                                 
                                   (9)
                          OKWA DI MKPA:-

Ndị Ihiala local Government ngalaba Athens Greece na-agwa ọhaneze ka ha biko do! doo!! dooo!!! gbatara ndị ụwa natụ n’ ọnụ, ndị Epkenta, nakwa ndị enweghị nne na nna ọsọ enyem aka dika ha bụ ndị Ihiala bidoworo ya n’ ihi  n’ ụmụ a ebela akwa ruru olisa nti. Ya mere ka anyi jisie ike ma nyere ha aka, ka Chineke we gozie anyi dum n’ ihi n’ onye atufughị ọnaghi atụta.


Nke abụọ, ndị Ihiala local government Area, n’ otu aka ahu ji obi ha nile we nayọ ọhaneze ka ha biko gbatara ha ọsọ enyem aka na-agbam ọnya ego iji we hụ na ndị ụwa natụ n’ ọnụ, ndị Ekpenta, nakwa ndị enweghị nne na nna agaghị atakwa ahụhụ ọzọ.
                                
                                                                                         

                               (10)
Aka akparala otu nwa –Amadị bụ onye ndi uwe Oji (ASNOMIA) na-aṣụsụ Greek na achọgharị na mapaghara America. Aka Kpara nwa Amadia n’ ihi iji egbe- (Gun) we zuo azụ n’ ime ngiga. Mgbe ndị uwe ojị ASNOMIA jidere ya, ha jụrụ ya aha ya, ọgwara ha n’ ezi aha nne na nna ya bara ya bụ Mazi OKE, na ya bi na nọmba 4 Ụlọ Street nke di n’ elu “CEILING”.


Ogakwara n’ihu ma kọwara ndị Uwe Oji (ASNOMIA) na ya gụsịrị akwụkwọ nke mgbe afọ asaa na Mahadum n’ obodo Greece, ma ọnweghị ọrụ ọbụla bụ nke government ala anyị nyere ya, n’ ọbụ ya mere ya ji gaa ohi iji we hụ ihe oriri ya na inọ nkiti bụ ngbọrọgwụ nke ekwensu.


Ndi ASNOMIA achọghị iji nti ha abụọ gee ihe Mazi Oke nekwu, kama ha gara n’ ihu iji ụtari we ghụọ ya ahu matụba ya n’ ime ụlọ nkpọrọ bụ nke anakpọ “LIFE IMPRISONMENT na-asụsụ bekee.”

                                                                
                                
                                 (11)
Mazi ngwere etiela ebewu, matakwa aka na-eze n’ ihi makpari nke ụmụ ntakịrị anyi n’ enye ya site n’ iji ya achụrụ nwa Ologbo aja. Okwuru nkea mgbe onye isi ụlọ anyi na-agba ya ajụjụ ọnụ n’ isi ụlọ anyi, ka ọyọrọ ọhaneze ka ha biko do! doo!! dooo!!! yọrọ ya ụmụ ntakịrị anyị bụ ndị nachụgharị ya n’ ọnweghị ihe ọbụla ya mere ha.


Osi na ya adịghị agba ha agba dika agbụsị, na ya adịghị atụ ha- atụ dika agwọ, ma na- abganyeghị nsogbu ndia nile bụ nke ya nadịghị enye ha, na ha adịghị eji anya ha abụọ hụ ya.


Okwuru n’ọbụrụ na ha ahapụghị ya aka, na ya ga ebidozi nyebe ha oke nsogbu dika ụmụ anụmanụ ibe ya ndị ozọ si enye ha nke nwere ike ibutere ha ọrịa Mmịnwu (Aids).                  

                      

                                  (12)
Onye isi ala bụ Mazi Mkpi ayọla ụmụ mmadu ka ha kwụsị ịkpọ ya Mkpi, ma nakpọ ya “HighCent”. Ogakwara n’ ihu makwupute n’ ọhaneze n’ eme ya mkpari site n’ igbaba ya ọtọ  n’ ihi na ya ahụbeghị nwoke Gbara afụ ọnụ ka ọgba ọtọ.

Ojiri obi ntiwa na- arịọọ, biko ka achitara ya ihe mkpuchi ọtọ nke anakpọ pant n’ ihi na “TEMKWE” ya nakpụzị na- ala.

Nke pụtara ka ndị Igbo biko n’ ezobe ọrụ ụmụ nne na umu nna ha nebe ọbụla ha nọọ n’ ihi na ha kwesiri ịbụ  ndị nche nwa nne ha n’ ụzọ ọbụla, n’ ịme ihe nile.

                                    
                               (13)
Onye ndu (Leader) Ihiala Local government ngalaba Athens Greece dika ọdị n’ ụbọchị taa, bụ Ichie, Ogbuehi, Ogbuagụ, Igwe Anselam Obunadike na ndị otua nile buru ụkpa ekele nke ha n’ udi pụrụ iche we n’ enye ọhaneze ndị  si ebo na- asụsụ diche iche we bia si ha nnọọ, n’ ukwu ha ji bia, ka ha ga ejị laa, ma ọbịara be onye abiagbula ya, ọgabụ ọlaba ka mkpumkpu ghara ipụta ya na- azụ.

                      
                          (14)
Na mpiachi akụkọ anyi, nụrụkwanụ isi okwu ghọrọ anyị akụkọ.
Mazi udele, ekwuola mkpa ọdị ka anyị biri n’ udo, n’ ihi na- ụwa abụghị ya ọghọm ahia, n’ ọbụ ya mere ya ji rigo elu Osisi ichere ozu ndị ọdị ọsọsọ n’ ihi n’ oriri abatarana ya n’ ụlọ napụghị ezi. Okenekwasiri Chi ya n’ ime ka anụ ya bụrụ ihe anadịghị eri-eri na- ala Igbo taa.

Orịọrọ ụmụ  mmadu ayịyọ  ka anyị biko yie ya n’ omume n’ ihi na ya enweghị onye iro ọbụla, ya mere ya ji ebe n’ ụlọ onye ukwu, bee n’ ụlọ onye nta.

Ogwụnụ ka ọham n’ ọnụ, ụnụ ga anụ ya ọzọ mgbe Atụrụ  wara mpi, Nwoke adi Ime, Akwu achaa n’ ọdụ  igu, Okeọkpa enyie akwa, Ji esiri n’ ite epuo ọme!

                 Ndewonu ụmụ Igbo ndị anyị ji eme ọn.

Umụ Ihiala ga-adị, Umụ Biafra ga-adị. Umụ Africa nile ga-adịkwa!!!!

              Onye hazịrị akụkọ Ụwa Nkea Bụ:

Mazi NNAMDI OBODOECHI (OJUKWU) Nke Greece


                            

No comments:

Post a Comment